Ilu 13:14
Proverbs 13:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ, nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.
Proverbs 13:14 in English
Proverbs 13:14 · Berean Standard Bible
The teaching * of the wise is a fountain of life, turning one from the snares of death.
Context
12Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi,
mgbe ihe a na-eche mezuru, oke ọṅụ na-adị. 13Onye na-elelị ntụziaka anya ga-akwụ ụgwọ nʼihi ya,
ma onye na-atụ egwu ihe enyere nʼiwu ga-anata ụgwọ ọrụ ya. 14Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ,
nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ. 15Ezi nghọta na-eweta ihuọma,
ma ụzọ nke ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eduba ha na mbibi. 16Onye nwere uche na-eji ọmụma ihe nʼarụ ọrụ,
ma ndị nzuzu na-egosipụta enweghị uche ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.