Ilu 13:10
Proverbs 13:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nganga na-eweta esemokwu, ma a na-ahụ amamihe nʼime ndụ ndị na-anata ndụmọdụ.
Proverbs 13:10 in English
Proverbs 13:10 · Berean Standard Bible
Arrogance leads only to strife, but wisdom is with the well-advised.
Context
8Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya,
ma ogbenye adịghị azaghachi mba banyere imerụ ya ahụ. 9Ìhè onye ezi omume na-enwupụ enwupụ,
ma oriọna onye mmebi iwu ga-anyụ. 10Nganga na-eweta esemokwu,
ma a na-ahụ amamihe nʼime ndụ ndị na-anata ndụmọdụ. 11Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa;
ma akụ sitere nʼịrụsị ọrụ ike na-eto eto. 12Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi,
mgbe ihe a na-eche mezuru, oke ọṅụ na-adị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.