Ilu 1:16
Proverbs 1:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ, na-emekwa ngwangwa iwufu ọbara.
Proverbs 1:16 in English
Proverbs 1:16 · Berean Standard Bible
For their feet run to evil, and they are swift to shed blood.
Context
14Soro anyị fee nza gị ka anyị nwaa ike anyị,
ihe ọbụla kwa anyị nwetara, anyị na gị ga-ekekọta ya ọnụ.” 15Nwa m, ejela ije nʼụzọ ndị dị otu a,
a zọọkwala ụkwụ nʼokporoụzọ ha; 16nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ,
na-emekwa ngwangwa iwufu ọbara. 17Ọ bụ ihe abaghị uru ịgbasa ụgbụ,
nʼebe nnụnụ ọbụla na-ahụ ya anya. 18Ma ndị a na-esi ọnya nke na-ama ha.
Ha onwe ha ka ọnya ahụ ga-ejide.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.