Native Bible

Numbers 9:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha mee ya nʼoge a kara aka, malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa a. Ha ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e ji eme ya si dị.”

Numbers 9:3 in English

Numbers 9:3 · Berean Standard Bible

You are to observe it at the appointed time, at twilight on the fourteenth * day of this month, in accordance with its statutes and ordinances.”

Context

1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ndị a nʼọzara Saịnaị nʼọnwa mbụ nʼafọ nke abụọ site nʼoge ha hapụrụ ala Ijipt. Ọ sịrị ya, 2“Gwa ụmụ Izrel ka ha mee Mmemme Ngabiga nʼoge a kara aka. 3Ha mee ya nʼoge a kara aka, malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa a. Ha ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e ji eme ya si dị.” 4Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel sị ha mee Mmemme Ngabiga. 5Ha mekwara ya nʼọzara Saịnaị malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa mbụ.* Ndị Izrel mere ihe niile nʼusoro dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.