Ọnụọgụgụ 8:10
Numbers 8:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kpọpụta ndị Livayị nʼihu Onyenwe anyị, ma mee ka ndị Izrel niile bikwasị ha aka ha.
Numbers 8:10 in English
Numbers 8:10 · Berean Standard Bible
You are to present the Levites before the LORD and have the Israelites lay their hands upon them.
Context
8Gwa ha ka ha weta nwa oke ehi na onyinye mkpụrụ ọka, bụ ụtụ ọka a gwara mmanụ. Ha ga-ewetakwa nwa oke ehi ọzọ; ka ọ bụrụ ihe ha ji achụ aja mmehie. 9Emesịa, kpọbata ụmụ Livayị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Meekwa ka ọgbakọ ndị Izrel niile zukọọ nʼebe ahụ. 10Kpọpụta ndị Livayị nʼihu Onyenwe anyị, ma mee ka ndị Izrel niile bikwasị ha aka ha. 11Mgbe ahụ, Erọn ga-ewere ndị Livayị chee Onyenwe anyị nʼihu dịka onyinye mfufe ndị Izrel niile na-enye ya. Nʼụzọ dị otu a, ụmụ Livayị niile ga-abụ ndị jikere ijere Onyenwe anyị ozi. 12“Emesịa, ndị Livayị ga-abịa bikwasị aka ha nʼisi oke ehi abụọ ndị ahụ jiri otu nʼime oke ehi abụọ ndị ahụ chụọ aja mmehie nye Onyenwe anyị, jiri nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ, maka ikpuchi mmehie ndị Livayị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.