Native Bible

Numbers 8:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gwa ha ka ha weta nwa oke ehi na onyinye mkpụrụ ọka, bụ ụtụ ọka a gwara mmanụ. Ha ga-ewetakwa nwa oke ehi ọzọ; ka ọ bụrụ ihe ha ji achụ aja mmehie.

Numbers 8:8 in English

Numbers 8:8 · Berean Standard Bible

Then have them take a young bull with its grain offering of fine flour mixed with oil, and you are to take a second young bull for a sin offering.

Context

6“Ugbu a, site nʼetiti ụmụ Izrel, kpọpụta ụmụ Livayị, doo ha iche, mee ha ka ha dịrị ọcha. 7Ime ka ha dị ọcha, lee ihe ị ga-eme. Fesa ha mmiri na-asachapụ mmehie. Hụkwa na ha kpụchapụrụ ajị niile dị ha nʼahụ, ma sachaa uwe ha. Si otu a mee ka ha bụrụ ndị dị ọcha. 8Gwa ha ka ha weta nwa oke ehi na onyinye mkpụrụ ọka, bụ ụtụ ọka a gwara mmanụ. Ha ga-ewetakwa nwa oke ehi ọzọ; ka ọ bụrụ ihe ha ji achụ aja mmehie. 9Emesịa, kpọbata ụmụ Livayị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Meekwa ka ọgbakọ ndị Izrel niile zukọọ nʼebe ahụ. 10Kpọpụta ndị Livayị nʼihu Onyenwe anyị, ma mee ka ndị Izrel niile bikwasị ha aka ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.