Ọnụọgụgụ 7:48
Numbers 7:48 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị nke asaa, Elishama, nwa Amihud, onyendu ebo Ifrem butere onyinye nke ya.
Numbers 7:48 in English
Numbers 7:48 · Berean Standard Bible
On the seventh day Elishama son of Ammihud, the leader of the Ephraimites, drew near.
Context
46O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, 47na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.
Nke a bụ onyinye Eliasaf nwa Deuel nyere. 48Nʼụbọchị nke asaa, Elishama, nwa Amihud, onyendu ebo Ifrem butere onyinye nke ya. 49Onyinye o wetara bụ:
otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. 50O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.