Native Bible

Numbers 6:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, agụba agaghị agabiga ya nʼisi. Ọ ga-anọgide bụrụ onye dị nsọ tutu ruo oge nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị zuru. Nʼihi nke a, ọ ga-ahapụ agịrị isi ya ka o too.

Numbers 6:5 in English

Numbers 6:5 · Berean Standard Bible

For the entire period of his vow of separation, no razor shall pass over his head. He must be holy until the time of his separation to the LORD is complete; he must let the hair of his head grow long.

Context

3ha ga-ekewapụ onwe ha site na ịṅụ mmanya, maọbụ detụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya ire. Ha agaghị aṅụ mmiri mkpụrụ vaịnị, ọ gaghị ata mkpụrụ vaịnị ọhụrụ maọbụ nke a mịkpọrọ amịkpọ. 4Oge ahụ niile ọ bụ onye Nazirait,* ọ gaghị eri ihe ọbụla sitere na mkpụrụ osisi vaịnị maọbụ mkpụrụ ya maọbụ okpokoro azụ ya. 5“ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, agụba agaghị agabiga ya nʼisi. Ọ ga-anọgide bụrụ onye dị nsọ tutu ruo oge nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị zuru. Nʼihi nke a, ọ ga-ahapụ agịrị isi ya ka o too. 6“ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, ọ gaghị aga nso mmadụ ọbụla nwụrụ anwụ, 7ọ bụladị na nna ya, maọbụ nne ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị anwụọ. Ọ gaghị emerụ onwe ya nʼihi ha, nʼihi na akara ikewapụ onwe ya iche nye Chineke dị ya nʼisi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.