Native Bible

Numbers 6:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọ bụladị na nna ya, maọbụ nne ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị anwụọ. Ọ gaghị emerụ onwe ya nʼihi ha, nʼihi na akara ikewapụ onwe ya iche nye Chineke dị ya nʼisi.

Numbers 6:7 in English

Numbers 6:7 · Berean Standard Bible

Even if his father or mother or brother or sister should die, he is not to defile himself, because the crown of consecration to his God is upon his head.

Context

5“ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, agụba agaghị agabiga ya nʼisi. Ọ ga-anọgide bụrụ onye dị nsọ tutu ruo oge nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị zuru. Nʼihi nke a, ọ ga-ahapụ agịrị isi ya ka o too. 6“ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, ọ gaghị aga nso mmadụ ọbụla nwụrụ anwụ, 7ọ bụladị na nna ya, maọbụ nne ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị anwụọ. Ọ gaghị emerụ onwe ya nʼihi ha, nʼihi na akara ikewapụ onwe ya iche nye Chineke dị ya nʼisi. 8Nʼoge niile nke ikewapụ onwe ya, onye e doro nsọ nye Onyenwe anyị ka ọ bụ. 9“ ‘Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ na mberede nʼakụkụ onye nazirait, si otu a merụọ agịrị isi ya nke na-egosi ido nsọ ya, ọ ghaghị ịkpacha isi ya nʼụbọchị nke asaa bụ ụbọchị ime ka ọ dị ọcha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.