Native Bible

Numbers 6:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Oge ahụ niile ọ bụ onye Nazirait,* ọ gaghị eri ihe ọbụla sitere na mkpụrụ osisi vaịnị maọbụ mkpụrụ ya maọbụ okpokoro azụ ya.

Numbers 6:4 in English

Numbers 6:4 · Berean Standard Bible

All the days of his separation, he is not to eat anything that comes from the grapevine, not even the seeds or skins.

Context

2Gwa ndị Izrel sị ha, “Mgbe nwoke maọbụ nwanyị ṅụrụ iyi* o ji kpebie ikwe nkwa pụrụ iche nke ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait, 3ha ga-ekewapụ onwe ha site na ịṅụ mmanya, maọbụ detụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya ire. Ha agaghị aṅụ mmiri mkpụrụ vaịnị, ọ gaghị ata mkpụrụ vaịnị ọhụrụ maọbụ nke a mịkpọrọ amịkpọ. 4Oge ahụ niile ọ bụ onye Nazirait,* ọ gaghị eri ihe ọbụla sitere na mkpụrụ osisi vaịnị maọbụ mkpụrụ ya maọbụ okpokoro azụ ya. 5“ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, agụba agaghị agabiga ya nʼisi. Ọ ga-anọgide bụrụ onye dị nsọ tutu ruo oge nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị zuru. Nʼihi nke a, ọ ga-ahapụ agịrị isi ya ka o too. 6“ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, ọ gaghị aga nso mmadụ ọbụla nwụrụ anwụ,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.