Ọnụọgụgụ 33:51
Numbers 33:51 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe unu gafere osimiri Jọdan banye nʼala Kenan,
Numbers 33:51 in English
Numbers 33:51 · Berean Standard Bible
“Speak to the Israelites and tell them: When you cross the Jordan into the land of Canaan,
Context
49Mgbe ha nọ nʼebe a, ha manyere ụlọ ikwu ha nʼebe dị iche iche nʼakụkụ osimiri Jọdan, site na Bet-Jeshimọt rute rịị ebe a na-akpọ Ebel-Shitim, nʼobosara ala Moab. 50Nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ Jọdan, na ncherita ihu Jeriko ka Onyenwe anyị nọ gwa Mosis okwu sị ya, 51“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe unu gafere osimiri Jọdan banye nʼala Kenan, 52unu aghaghị ịchụpụ ndị niile bi nʼebe ahụ ma bibie chi niile ha na-efe, ndị ha ji nkume tụọ na ndị ha kpụrụ akpụ. Unu ga-ebibikwa ebe niile dị nʼelu ugwu niile, ebe ha na-anọ efe arụsị ha niile ofufe. 53Nwetanụ ala ahụ, birikwa nʼime ya, nʼihi na enyela m unu ala ahụ ka unu nwere ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.