Ọnụọgụgụ 33:49
Numbers 33:49 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ha nọ nʼebe a, ha manyere ụlọ ikwu ha nʼebe dị iche iche nʼakụkụ osimiri Jọdan, site na Bet-Jeshimọt rute rịị ebe a na-akpọ Ebel-Shitim, nʼobosara ala Moab.
Numbers 33:49 in English
Numbers 33:49 · Berean Standard Bible
And there on the plains of Moab they camped by the Jordan, from Beth-jeshimoth to Abel-shittim.*
Context
47Ha hapụrụ Almon Diblataim bịaruo nʼugwu Abarim nke dị nso na Nebo ebe ha mara ụlọ ikwu ha. 48Ha hapụrụ ugwu Abarim bata nʼobosara ala Moab nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ebe ha mara ụlọ ikwu ha. 49Mgbe ha nọ nʼebe a, ha manyere ụlọ ikwu ha nʼebe dị iche iche nʼakụkụ osimiri Jọdan, site na Bet-Jeshimọt rute rịị ebe a na-akpọ Ebel-Shitim, nʼobosara ala Moab. 50Nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ Jọdan, na ncherita ihu Jeriko ka Onyenwe anyị nọ gwa Mosis okwu sị ya, 51“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe unu gafere osimiri Jọdan banye nʼala Kenan,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.