Native Bible

Numbers 33:52 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

unu aghaghị ịchụpụ ndị niile bi nʼebe ahụ ma bibie chi niile ha na-efe, ndị ha ji nkume tụọ na ndị ha kpụrụ akpụ. Unu ga-ebibikwa ebe niile dị nʼelu ugwu niile, ebe ha na-anọ efe arụsị ha niile ofufe.

Numbers 33:52 in English

Numbers 33:52 · Berean Standard Bible

you must drive out before you all the inhabitants of the land, destroy all their carved images and cast idols, and demolish all their high places.

Context

50Nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ Jọdan, na ncherita ihu Jeriko ka Onyenwe anyị nọ gwa Mosis okwu sị ya, 51“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe unu gafere osimiri Jọdan banye nʼala Kenan, 52unu aghaghị ịchụpụ ndị niile bi nʼebe ahụ ma bibie chi niile ha na-efe, ndị ha ji nkume tụọ na ndị ha kpụrụ akpụ. Unu ga-ebibikwa ebe niile dị nʼelu ugwu niile, ebe ha na-anọ efe arụsị ha niile ofufe. 53Nwetanụ ala ahụ, birikwa nʼime ya, nʼihi na enyela m unu ala ahụ ka unu nwere ya. 54Unu ga-eke ala ahụ site nʼife nza, dịka agbụrụ unu niile si dị. Ndị bara ụba nye ha ihe nketa dị ukwuu, ndị dị ole na ole nye ha ihe nketa dị nta. Ihe ọ bụla ruuru agbụrụ ọbụla site nʼife nza ga-abụ nke ha. Kee ya dịka ebo nna nna unu ha si dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.