Native Bible

Numbers 32:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na unu ajụ iso Onyenwe anyị ugbu a, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ndị Izrel nọgide nʼọzara. Mbibi na ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha ga-abụkwa nke unu ji aka unu kpatara ha.”

Numbers 32:15 in English

Numbers 32:15 · Berean Standard Bible

For if you turn away from following Him, He will once again leave this people in the wilderness, and you will be the cause of their destruction.”

Context

13Iwe Onyenwe anyị dịịrị ọkụ megide Izrel, o mere ka ha wagharịa nʼọzara iri afọ anọ, tutu ruo mgbe ọgbọ ahụ niile nke mere ihe ọjọọ nʼanya ya nwụchara. 14“Ma lee unu ugbu a, agbụrụ ndị mmehie, ọ bụkwa otu ihe ahụ ka unu na-eme! Unu na-achọ ime ka iwe dị ukwuu wee Onyenwe anyị megide ndị Izrel. 15Ọ bụrụ na unu ajụ iso Onyenwe anyị ugbu a, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ndị Izrel nọgide nʼọzara. Mbibi na ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha ga-abụkwa nke unu ji aka unu kpatara ha.” 16Ma ha zara sị ya, “Ọ gaghị adị otu a! Anyị ga-ewuru anụ ụlọ anyị ụlọ, tinye igwe ewu na atụrụ anyị nʼime ha. Anyị ga-ewukwara ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị obodo ebe ha ga-anọ. 17Ma anyị onwe anyị ga-eburu ngwa agha anyị, buru ndị Izrel niile ọzọ ụzọ gaa nʼihu ịlụ ọgụ, tutu anyị edubata ha nʼala nke ha ga-eketa. Ma ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị ga-anọ nʼobodo e wusiri ike, ikpuchite ezinaụlọ anyị niile site nʼaka ndị iro bi anyị gburugburu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.