Native Bible

Numbers 32:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma anyị onwe anyị ga-eburu ngwa agha anyị, buru ndị Izrel niile ọzọ ụzọ gaa nʼihu ịlụ ọgụ, tutu anyị edubata ha nʼala nke ha ga-eketa. Ma ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị ga-anọ nʼobodo e wusiri ike, ikpuchite ezinaụlọ anyị niile site nʼaka ndị iro bi anyị gburugburu.

Numbers 32:17 in English

Numbers 32:17 · Berean Standard Bible

But we will arm ourselves and be ready * to go ahead of the Israelites until we have brought them into their place. Meanwhile, our little ones will remain in the fortified cities for protection from the inhabitants of the land.

Context

15Ọ bụrụ na unu ajụ iso Onyenwe anyị ugbu a, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ndị Izrel nọgide nʼọzara. Mbibi na ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha ga-abụkwa nke unu ji aka unu kpatara ha.” 16Ma ha zara sị ya, “Ọ gaghị adị otu a! Anyị ga-ewuru anụ ụlọ anyị ụlọ, tinye igwe ewu na atụrụ anyị nʼime ha. Anyị ga-ewukwara ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị obodo ebe ha ga-anọ. 17Ma anyị onwe anyị ga-eburu ngwa agha anyị, buru ndị Izrel niile ọzọ ụzọ gaa nʼihu ịlụ ọgụ, tutu anyị edubata ha nʼala nke ha ga-eketa. Ma ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị ga-anọ nʼobodo e wusiri ike, ikpuchite ezinaụlọ anyị niile site nʼaka ndị iro bi anyị gburugburu. 18Anyị agaghị alọta nʼụlọ anyị tutu onye Izrel ọbụla enweta ihe nketa nke ya. 19Anyị achọghị ihe nketa, nʼofe Jọdan nke ọzọ, nʼihi na anyị ewerela oke nke anyị nʼebe a, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.