Native Bible

Numbers 32:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Iwe Onyenwe anyị dịịrị ọkụ megide Izrel, o mere ka ha wagharịa nʼọzara iri afọ anọ, tutu ruo mgbe ọgbọ ahụ niile nke mere ihe ọjọọ nʼanya ya nwụchara.

Numbers 32:13 in English

Numbers 32:13 · Berean Standard Bible

The anger of the LORD burned against Israel, and He made them wander in the wilderness forty years, until the whole generation who had done evil in His sight was gone.

Context

11‘Nʼihi na unu jụrụ iji obi unu niile gbasoo m, o nweghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ o si nʼala Ijipt kpọpụta, ndị gbara iri afọ abụọ rigoo, ga-ahụ ala ahụ m kwere Ebraham na Aịzik na Jekọb nkwa inye ha.’ 12Naanị ndị ọṅụṅụ iyi a na-emegideghị bụ Kaleb, nwa Jefune onye Keniz,* na Joshua nwa Nun, nʼihi na ha jiri obi ha niile sogide Onyenwe anyị. 13Iwe Onyenwe anyị dịịrị ọkụ megide Izrel, o mere ka ha wagharịa nʼọzara iri afọ anọ, tutu ruo mgbe ọgbọ ahụ niile nke mere ihe ọjọọ nʼanya ya nwụchara. 14“Ma lee unu ugbu a, agbụrụ ndị mmehie, ọ bụkwa otu ihe ahụ ka unu na-eme! Unu na-achọ ime ka iwe dị ukwuu wee Onyenwe anyị megide ndị Izrel. 15Ọ bụrụ na unu ajụ iso Onyenwe anyị ugbu a, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ndị Izrel nọgide nʼọzara. Mbibi na ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha ga-abụkwa nke unu ji aka unu kpatara ha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.