Native Bible

Numbers 31:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọkara nke ahụ dịrị ndị Izrel, nke Mosis kewapụtara site na nke ndị ikom lụrụ agha.

Numbers 31:42 in English

Numbers 31:42 · Berean Standard Bible

From the Israelites’ half, which Moses had set apart from the men who had gone to war,

Context

40Ọnụọgụgụ ụmụ agbọghọ dị puku iri na isii (16,000). Ndị e nyere Onyenwe anyị dị iri atọ na abụọ (32). 41Mosis nyere Elieza bụ onye nchụaja Onyenwe anyị oke nʼihe ndị ahụ niile a tụrụ nʼụtụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 42Ma ọkara nke ahụ dịrị ndị Izrel, nke Mosis kewapụtara site na nke ndị ikom lụrụ agha. 43Ọkara nke nzukọ dị, igwe ewu na atụrụ, narị puku atọ, iri puku atọ, puku asaa na narị ise (337,500), 44igwe ehi, iri puku atọ na isii (36,000),

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.