Ọnụọgụgụ 27:15
Numbers 27:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis zara Onyenwe anyị sị ya,
Numbers 27:15 in English
Numbers 27:15 · Berean Standard Bible
So Moses appealed to the LORD,
Context
13Mgbe i lechasịrị ya, ị ga-anwụ dịka nwanne gị Erọn nwụrụ. 14Nʼihi na unu nupuru isi nye okwu m nʼọzara Zin, mgbe ọgbakọ ụmụ Izrel sesịrị m okwu. Unu abụọ nupuru isi nʼiwu m ido m nsọ nʼihu ha.” (Ndị a bụ mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin.) 15Mosis zara Onyenwe anyị sị ya, 16“Ka Onyenwe anyị, Chineke nwe mmụọ nke mmadụ niile, họpụta onyendu ga-elekọta ọgbakọ a. 17Onye ga na-apụ na-abatakwa nʼihu ha, onye ga na-edu ha pụọ, duru ha batakwa, ka ndị Onyenwe anyị ghara ịdị ka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.