Ọnụọgụgụ 27:13
Numbers 27:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe i lechasịrị ya, ị ga-anwụ dịka nwanne gị Erọn nwụrụ.
Numbers 27:13 in English
Numbers 27:13 · Berean Standard Bible
After you have seen it, you too will be gathered to your people, as your brother Aaron was;
Context
11Ọ bụrụkwa na o nweghị ndị nwoke bụ ụmụnne nna ya, mgbe ahụ ihe nketa ya ga-alara onye dịkarịrị ya nso nʼikwu ya, ka ọ bụrụ nke ya. Nke a bụ iwu dịrị ndị Izrel niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.’ ” 12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya: “Gaa rigoro nʼugwu Abarim site nʼebe ahụ lefee anya nʼofe mmiri Jọdan leruo ala ahụ nke m nyere ụmụ Izrel anya. 13Mgbe i lechasịrị ya, ị ga-anwụ dịka nwanne gị Erọn nwụrụ. 14Nʼihi na unu nupuru isi nye okwu m nʼọzara Zin, mgbe ọgbakọ ụmụ Izrel sesịrị m okwu. Unu abụọ nupuru isi nʼiwu m ido m nsọ nʼihu ha.” (Ndị a bụ mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin.) 15Mosis zara Onyenwe anyị sị ya,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.