Ọnụọgụgụ 26:4
Numbers 26:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gụọnụ ndị ikom gbara iri afọ abụọ gafee ọnụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.” Ndị a bụ ndị Izrel si Ijipt pụta:
Numbers 26:4 in English
Numbers 26:4 · Berean Standard Bible
“Take a census of the men twenty years of age or older,* as the LORD has commanded Moses.” And these were the Israelites who came out of the land of Egypt:
Context
2“Gaanụ gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ nzukọ niile nke ụmụ Izrel dịka ezinaụlọ ha si dị; ndị niile gbara iri afọ abụọ gafee. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị nwere ike ije agha.” 3Ya mere, na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ka Mosis na Elieza onye nchụaja nọ gwa ha okwu sị ha, 4“Gụọnụ ndị ikom gbara iri afọ abụọ gafee ọnụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.”
Ndị a bụ ndị Izrel si Ijipt pụta: 5Ụmụ ụmụ Ruben, ọkpara Izrel, bụ ndị a:
site na Hanok, ikwu Hanok,
site na Palu, ikwu Palu, 6site na Hezrọn, ikwu Hezrọn
site na Kami, ikwu Kami
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.