Native Bible

Numbers 26:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ka Mosis na Elieza onye nchụaja nọ gwa ha okwu sị ha,

Numbers 26:3 in English

Numbers 26:3 · Berean Standard Bible

So on the plains of Moab by the Jordan, across from Jericho, Moses and Eleazar the priest issued the instruction,

Context

1Mgbe ihe otiti ahụ niile gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis na Elieza nwa Erọn, onye nchụaja okwu sị ha, 2“Gaanụ gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ nzukọ niile nke ụmụ Izrel dịka ezinaụlọ ha si dị; ndị niile gbara iri afọ abụọ gafee. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị nwere ike ije agha.” 3Ya mere, na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ka Mosis na Elieza onye nchụaja nọ gwa ha okwu sị ha, 4“Gụọnụ ndị ikom gbara iri afọ abụọ gafee ọnụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.” Ndị a bụ ndị Izrel si Ijipt pụta: 5Ụmụ ụmụ Ruben, ọkpara Izrel, bụ ndị a: site na Hanok, ikwu Hanok, site na Palu, ikwu Palu,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.