Native Bible

Numbers 25:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, gwa ya, na m na-eme ka ọgbụgba ndụ udo m dịrị ya.

Numbers 25:12 in English

Numbers 25:12 · Berean Standard Bible

Declare, therefore, that I am granting him My covenant of peace.

Context

10Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 11“Finehaz nwa Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja, emeela ka iwe m megide Izrel dajụọ. Nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi dịka mụ onwe m banyere idebe nsọpụrụ m nsọ nʼetiti ha, ka m ghara isite nʼịnụ ọkụ nke obi m bibie ha. 12Ya mere, gwa ya, na m na-eme ka ọgbụgba ndụ udo m dịrị ya. 13Ya na ụmụ ụmụ ya ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke ịrụ ọrụ nchụaja ga-adịrị, nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi banyere nsọpụrụ nke Chineke ya, si otu a chụọrọ ndị Izrel aja ikpuchi mmehie.” 14Aha nwoke Izrel ahụ e gburu ya na nwanyị onye Midia ahụ bụ Zimri, nwa Salu, onyendu otu ezinaụlọ nʼebo Simiọn.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.