Native Bible

Numbers 25:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Finehaz nwa Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja, emeela ka iwe m megide Izrel dajụọ. Nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi dịka mụ onwe m banyere idebe nsọpụrụ m nsọ nʼetiti ha, ka m ghara isite nʼịnụ ọkụ nke obi m bibie ha.

Numbers 25:11 in English

Numbers 25:11 · Berean Standard Bible

“Phinehas son of Eleazar, the son of Aaron the priest, has turned My wrath away from the Israelites; for he was zealous for My sake among them, so that I did not consume the Israelites in My zeal.

Context

9Ma tupu ihe otiti ahụ akwụsị, ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ruru iri puku abụọ na anọ (24,000) anwụọlarị. 10Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 11“Finehaz nwa Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja, emeela ka iwe m megide Izrel dajụọ. Nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi dịka mụ onwe m banyere idebe nsọpụrụ m nsọ nʼetiti ha, ka m ghara isite nʼịnụ ọkụ nke obi m bibie ha. 12Ya mere, gwa ya, na m na-eme ka ọgbụgba ndụ udo m dịrị ya. 13Ya na ụmụ ụmụ ya ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke ịrụ ọrụ nchụaja ga-adịrị, nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi banyere nsọpụrụ nke Chineke ya, si otu a chụọrọ ndị Izrel aja ikpuchi mmehie.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.