Ọnụọgụgụ 21:31
Numbers 21:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ụmụ Izrel bichiri nʼala ndị Amọrait.
Numbers 21:31 in English
Numbers 21:31 · Berean Standard Bible
So Israel lived in the land of the Amorites.
Context
29Ahụhụ dịrị gị Moab!
Ndị a lara nʼiyi ka unu bụ, unu ndị Kemosh.
Ụmụ ya ndị ikom aghọọla ndị na-enweghị ebe obibi.
A dọtala ụmụ ndị inyom nʼagha,
nye Saịhọn eze ndị Amọrait. 30“Ma anyị ebibiela ha,
bibie Heshbọn ruo rịị na Dibọn,
bibie ha ruo Nofa,
ruokwa rịị Medeba.” 31Ya mere, ụmụ Izrel bichiri nʼala ndị Amọrait. 32Emesịa, Mosis zipụrụ ndị nnyopụta ka ha ga nyochaa Jeza. Ụmụ Izrel tigburu obodo niile dị gburugburu ya chụpụkwa ndị Amọrait bi nʼebe ahụ. 33Mgbe ahụ, ha chigharịrị gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụọ izute ha na Edrei.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.