Ọnụọgụgụ 21:32
Numbers 21:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, Mosis zipụrụ ndị nnyopụta ka ha ga nyochaa Jeza. Ụmụ Izrel tigburu obodo niile dị gburugburu ya chụpụkwa ndị Amọrait bi nʼebe ahụ.
Numbers 21:32 in English
Numbers 21:32 · Berean Standard Bible
After Moses had sent spies to Jazer, Israel captured its villages and drove out the Amorites who were there.
Context
30“Ma anyị ebibiela ha,
bibie Heshbọn ruo rịị na Dibọn,
bibie ha ruo Nofa,
ruokwa rịị Medeba.” 31Ya mere, ụmụ Izrel bichiri nʼala ndị Amọrait. 32Emesịa, Mosis zipụrụ ndị nnyopụta ka ha ga nyochaa Jeza. Ụmụ Izrel tigburu obodo niile dị gburugburu ya chụpụkwa ndị Amọrait bi nʼebe ahụ. 33Mgbe ahụ, ha chigharịrị gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụọ izute ha na Edrei. 34Ma Onyenwe anyị gwara Mosis okwu, sị, “Atụla ya egwu nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait onyeisi obodo ya bụ Heshbọn.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.