Ọnụọgụgụ 20:23
Numbers 20:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼugwu Hor, nʼoke ala Edọm, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
Numbers 20:23 in English
Numbers 20:23 · Berean Standard Bible
And at Mount Hor, near the border of the land of Edom, the LORD said to Moses and Aaron,
Context
21Ebe ọ bụ na ndị Edọm ekweghị ka ndị Izrel si nʼoke ala ha gafee, ndị Izrel tụgharịrị azụ hapụ isi ụzọ ahụ. 22Ọgbakọ Izrel niile sitere na Kadesh bulie ije gagide rute nʼugwu Hor. 23Nʼugwu Hor, nʼoke ala Edọm, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha, 24“Oge eruola mgbe Erọn ga-anwụ. Ọ gaghị abanye nʼala ahụ m nyere ụmụ Izrel, nʼihi na unu abụọ nupuru isi nʼiwu m na mmiri Meriba. 25Ugbu a, kpọrọ Erọn na nwa ya nwoke Elieza, duru ha gaa nʼugwu Hor.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.