Ọnụọgụgụ 20:21
Numbers 20:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebe ọ bụ na ndị Edọm ekweghị ka ndị Izrel si nʼoke ala ha gafee, ndị Izrel tụgharịrị azụ hapụ isi ụzọ ahụ.
Numbers 20:21 in English
Numbers 20:21 · Berean Standard Bible
So Edom refused to allow Israel to pass through their territory, and Israel turned away from them.
Context
19Ma ndị Izrel zara ozi o ziri sị ya,
“Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-esi gafee. Ọ bụrụ na anyị maọbụ anụ ụlọ anyị a ṅụọ mmiri dị nʼala gị, anyị ga-akwụ ọnụahịa ya. Naanị mkpa anyị bụ ịgafe. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị chọrọ.” 20Ma eze Edọm aṅaghị ntị, ọ gwaghere ha ọnụ sị,
“Unu agaghị esite nʼala gabiga.”
Edọm chịkọtara ọtụtụ ndị agha dị ike duru ha pụọ ịga izute ha. 21Ebe ọ bụ na ndị Edọm ekweghị ka ndị Izrel si nʼoke ala ha gafee, ndị Izrel tụgharịrị azụ hapụ isi ụzọ ahụ. 22Ọgbakọ Izrel niile sitere na Kadesh bulie ije gagide rute nʼugwu Hor. 23Nʼugwu Hor, nʼoke ala Edọm, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.