Native Bible

Numbers 20:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọgbakọ Izrel niile sitere na Kadesh bulie ije gagide rute nʼugwu Hor.

Numbers 20:22 in English

Numbers 20:22 · Berean Standard Bible

After they had set out from Kadesh, the whole congregation of Israel came to Mount Hor.

Context

20Ma eze Edọm aṅaghị ntị, ọ gwaghere ha ọnụ sị, “Unu agaghị esite nʼala gabiga.” Edọm chịkọtara ọtụtụ ndị agha dị ike duru ha pụọ ịga izute ha. 21Ebe ọ bụ na ndị Edọm ekweghị ka ndị Izrel si nʼoke ala ha gafee, ndị Izrel tụgharịrị azụ hapụ isi ụzọ ahụ. 22Ọgbakọ Izrel niile sitere na Kadesh bulie ije gagide rute nʼugwu Hor. 23Nʼugwu Hor, nʼoke ala Edọm, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha, 24“Oge eruola mgbe Erọn ga-anwụ. Ọ gaghị abanye nʼala ahụ m nyere ụmụ Izrel, nʼihi na unu abụọ nupuru isi nʼiwu m na mmiri Meriba.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.