Ọnụọgụgụ 12:9
Numbers 12:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha. O si nʼebe ha nọ pụọ.
Numbers 12:9 in English
Numbers 12:9 · Berean Standard Bible
So the anger of the LORD burned against them, and He departed.
Context
7Ma nʼebe ohu m Mosis nọ, o sighị otu a dịrị,
ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼụlọ m niile. 8Nʼebe ọ nọ, ana m agwa ya okwu ihu na ihu
nʼụzọ doro anya, ọ bụghị site nʼilu,
ọ na-ahụkwa ụdịdị Onyenwe anyị.
Gịnị mere ụjọ atụghị unu
ikwu okwu megide ohu m Mosis?” 9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha. O si nʼebe ha nọ pụọ. 10Ma mgbe igwe ojii ahụ hapụrụ ụlọ nzute ahụ, lee Miriam ebe o guzo, ekpenta tiwapụtara ya nʼahụ dịka nzu ọcha. Mgbe Erọn tụgharịrị ebe ọ nọ hụ na ọ ghọọla onye ekpenta, 11ọ gwara Mosis okwu sị, “Biko, onyenwe m, atala anyị ahụhụ nʼihi mmehie anyị sitere na nzuzu mee.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.