Ọnụọgụgụ 12:8
Numbers 12:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼebe ọ nọ, ana m agwa ya okwu ihu na ihu nʼụzọ doro anya, ọ bụghị site nʼilu, ọ na-ahụkwa ụdịdị Onyenwe anyị. Gịnị mere ụjọ atụghị unu ikwu okwu megide ohu m Mosis?”
Numbers 12:8 in English
Numbers 12:8 · Berean Standard Bible
I speak with him face to face, clearly and not in riddles; he sees the form of the LORD. Why then were you unafraid to speak against My servant Moses?”
Context
6Onyenwe anyị gwara ha sị, “Geenụ ntị nʼokwu m ndị a:
“Mgbe onye amụma nọ nʼetiti unu,
Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-egosi ya onwe m site nʼọhụ.
Ana m agwa ya okwu site na nrọ. 7Ma nʼebe ohu m Mosis nọ, o sighị otu a dịrị,
ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼụlọ m niile. 8Nʼebe ọ nọ, ana m agwa ya okwu ihu na ihu
nʼụzọ doro anya, ọ bụghị site nʼilu,
ọ na-ahụkwa ụdịdị Onyenwe anyị.
Gịnị mere ụjọ atụghị unu
ikwu okwu megide ohu m Mosis?” 9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha. O si nʼebe ha nọ pụọ. 10Ma mgbe igwe ojii ahụ hapụrụ ụlọ nzute ahụ, lee Miriam ebe o guzo, ekpenta tiwapụtara ya nʼahụ dịka nzu ọcha. Mgbe Erọn tụgharịrị ebe ọ nọ hụ na ọ ghọọla onye ekpenta,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.