Ọnụọgụgụ 12:6
Numbers 12:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị gwara ha sị, “Geenụ ntị nʼokwu m ndị a: “Mgbe onye amụma nọ nʼetiti unu, Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-egosi ya onwe m site nʼọhụ. Ana m agwa ya okwu site na nrọ.
Numbers 12:6 in English
Numbers 12:6 · Berean Standard Bible
He said, “Hear now My words: If there is a prophet among you, I, the LORD, will reveal Myself to him in a vision; I will speak to him in a dream.
Context
4Na mberede, Onyenwe anyị sịrị Mosis, na Erọn, na Miriam, “Pụtanụ, bịa nʼụlọ nzute, unu mmadụ atọ” Ya mere ha atọ pụtara. 5Mgbe ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime igwe ojii, guzoro na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, kpọpụta Erọn na Miriam. Mgbe ha abụọ bịara nso. 6Onyenwe anyị gwara ha sị, “Geenụ ntị nʼokwu m ndị a:
“Mgbe onye amụma nọ nʼetiti unu,
Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-egosi ya onwe m site nʼọhụ.
Ana m agwa ya okwu site na nrọ. 7Ma nʼebe ohu m Mosis nọ, o sighị otu a dịrị,
ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼụlọ m niile. 8Nʼebe ọ nọ, ana m agwa ya okwu ihu na ihu
nʼụzọ doro anya, ọ bụghị site nʼilu,
ọ na-ahụkwa ụdịdị Onyenwe anyị.
Gịnị mere ụjọ atụghị unu
ikwu okwu megide ohu m Mosis?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.