Native Bible

Numbers 11:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Anyị chetara azụ anyị tara nʼIjipt, nke na-adịghị efu anyị ego, ya na kukumba, na melọn,* na liik, na ayo* na galiik.

Numbers 11:5 in English

Numbers 11:5 · Berean Standard Bible

We remember the fish we ate freely in Egypt, along with the cucumbers, melons, leeks, onions, and garlic.

Context

3Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Tabera, nʼihi ọkụ ahụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ ree nʼetiti ha. 4Ndị amakekwu so ụmụ Izrel nʼije a malitere itamu ntamu banyere nri ndị ọzọ na-agụ ha agụụ. Nke a mere ka ụmụ Izrel malite ịkwa akwa, na-asị, “A sịkwarị na anyị nwere anụ anyị ga-ata. 5Anyị chetara azụ anyị tara nʼIjipt, nke na-adịghị efu anyị ego, ya na kukumba, na melọn,* na liik, na ayo* na galiik. 6Ma ugbu a, anyị enweghịkwa agụụ iri nri, nʼihi na site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọ bụ naanị mánà bụ ihe oriri anyị nwere.” 7Mánà dịka mkpụrụ kọrianda, na-acha ka eso osisi kpọrọ nkụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.