Ọnụọgụgụ 11:7
Numbers 11:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mánà dịka mkpụrụ kọrianda, na-acha ka eso osisi kpọrọ nkụ.
Numbers 11:7 in English
Numbers 11:7 · Berean Standard Bible
Now the manna resembled coriander seed, and its appearance was like that of gum resin.
Context
5Anyị chetara azụ anyị tara nʼIjipt, nke na-adịghị efu anyị ego, ya na kukumba, na melọn,* na liik, na ayo* na galiik. 6Ma ugbu a, anyị enweghịkwa agụụ iri nri, nʼihi na site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọ bụ naanị mánà bụ ihe oriri anyị nwere.” 7Mánà dịka mkpụrụ kọrianda, na-acha ka eso osisi kpọrọ nkụ. 8Ndị Izrel na-ejegharị na-achịkọta ha. Emesịa, ha na-eji nkume e ji akwọ nri na-akwọri ha. Oge ụfọdụ, ha na-eji ikwe nri sụọ ya. Emesịa, ha na-esi ya esi, maọbụ ghee ya eghe. Ọ na-atọ dịka ihe e ji mmanụ oliv ghee. 9Mánà ndị a na-ada mgbe igirigi dara nʼọmụma ụlọ ikwu nʼabalị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.