Ọnụọgụgụ 1:3
Numbers 1:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị na Erọn ga-agụkọta ndị ikom Izrel niile gbara iri afọ abụọ maọbụ karịa ọnụ, bụ ndị tozuru ije agha. Unu ga-edo ha nʼusuu, nʼusuu.
Numbers 1:3 in English
Numbers 1:3 · Berean Standard Bible
You and Aaron are to number those who are twenty years of age or older by their divisions—everyone who can serve in Israel’s army.
Context
1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị, nʼime ụlọ nzute, nʼụbọchị nke mbụ,* nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ, mgbe ụmụ Izrel pụtachara site nʼobodo Ijipt. Ọ sịrị, 2“Gaa gụọ ma chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile e nwere nʼetiti ọgbakọ Izrel, dịka ebo ha na agbụrụ ha si dị, na dịka ezinaụlọ ha si dịkwa. Depụta aha nwoke ọbụla nʼotu na otu. 3Gị na Erọn ga-agụkọta ndị ikom Izrel niile gbara iri afọ abụọ maọbụ karịa ọnụ, bụ ndị tozuru ije agha. Unu ga-edo ha nʼusuu, nʼusuu. 4Otu nwoke, site nʼebo Izrel ọbụla, onye bụ onyendu ezinaụlọ, ga-esonyere unu nʼọrụ a. 5“Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ ga-enyere unu aka.
“Site nʼebo Ruben, Elizọ na Shedeua,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.