Nehemaya 9:17
Nehemiah 9:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha egeghị ntị ọbụla, ha echetakwaghị ihe ịrịbama niile i meere ha. Kama ha nupuru isi họpụtara onwe ha onyeisi ga-eduru ha ịlaghachi Ijipt. Ma ị bụ Chineke onye na-eme ebere, onye na-agbaghara mmehie ndị gị mgbe ọbụla. Ị bụ onye obiọma, onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. I jupụtara nʼịhụnanya na amara mgbe niile. Nʼihi ya, ị gbakụtaghị ha azụ,
Nehemiah 9:17 in English
Nehemiah 9:17 · Berean Standard Bible
They refused to listen and failed to remember the wonders You performed among them. They stiffened their necks and appointed a leader to return them to their bondage in Egypt.* But You are a forgiving God, gracious and compassionate, slow to anger and rich in loving devotion, and You did not forsake them.
Context
15I sitere nʼeluigwe nye ha achịcha mgbe agụụ gụrụ ha, sitekwa na nkume nye ha mmiri mgbe akpịrị kpọrọ ha nkụ. I sịkwara ha baa nʼime ala ahụ inweta ala ahụ bụ nke i weliri aka gị ṅụọ iyi inye ha. 16“Ma nna nna anyị ha erubeghị isi nʼokwu gị, nʼihi isiike ha na nganga ha. 17Ha egeghị ntị ọbụla, ha echetakwaghị ihe ịrịbama niile i meere ha. Kama ha nupuru isi họpụtara onwe ha onyeisi ga-eduru ha ịlaghachi Ijipt. Ma ị bụ Chineke onye na-eme ebere, onye na-agbaghara mmehie ndị gị mgbe ọbụla. Ị bụ onye obiọma, onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. I jupụtara nʼịhụnanya na amara mgbe niile. Nʼihi ya, ị gbakụtaghị ha azụ, 18ọ bụladị mgbe ha meere onwe ha nwa ehi ha kpụrụ akpụ kwuo sị, ‘Nke a bụ chi unu. Ọ bụ ya si nʼala Ijipt dupụta anyị,’ maọbụ mgbe ha mehiere megide gị nʼụzọ niile. 19“Ma nʼihi obi ebere gị nke dị ukwuu, ị hapụghị ha ka ha nwụọ nʼọzara. Ogidi igwe ojii ahụ duuru ha ụbọchị niile, ma ogidi ọkụ ahụ dukwara ha abalị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.