Nehemaya 9:19
Nehemiah 9:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma nʼihi obi ebere gị nke dị ukwuu, ị hapụghị ha ka ha nwụọ nʼọzara. Ogidi igwe ojii ahụ duuru ha ụbọchị niile, ma ogidi ọkụ ahụ dukwara ha abalị niile.
Nehemiah 9:19 in English
Nehemiah 9:19 · Berean Standard Bible
You in Your great compassion did not forsake them in the wilderness. By day the pillar of cloud never turned away from guiding them on their path; and by the night the pillar of fire illuminated the way they should go.
Context
17Ha egeghị ntị ọbụla, ha echetakwaghị ihe ịrịbama niile i meere ha. Kama ha nupuru isi họpụtara onwe ha onyeisi ga-eduru ha ịlaghachi Ijipt. Ma ị bụ Chineke onye na-eme ebere, onye na-agbaghara mmehie ndị gị mgbe ọbụla. Ị bụ onye obiọma, onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. I jupụtara nʼịhụnanya na amara mgbe niile. Nʼihi ya, ị gbakụtaghị ha azụ, 18ọ bụladị mgbe ha meere onwe ha nwa ehi ha kpụrụ akpụ kwuo sị, ‘Nke a bụ chi unu. Ọ bụ ya si nʼala Ijipt dupụta anyị,’ maọbụ mgbe ha mehiere megide gị nʼụzọ niile. 19“Ma nʼihi obi ebere gị nke dị ukwuu, ị hapụghị ha ka ha nwụọ nʼọzara. Ogidi igwe ojii ahụ duuru ha ụbọchị niile, ma ogidi ọkụ ahụ dukwara ha abalị niile. 20I zitere ezi Mmụọ nke gị ime ka ha nwee uche. Ị gbochikwaghị mánà gị iru ha ọnụ, ị nyekwara ha mmiri nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ ha. 21Iri afọ anọ ka i debere ha ndụ nʼọzara. Ọ dịghị ihe kọrọ ha nʼoge ahụ. Uwe ha akaghị nka, ukwu ha azaghị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.