Native Bible

Nehemiah 9:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

I sitere nʼeluigwe nye ha achịcha mgbe agụụ gụrụ ha, sitekwa na nkume nye ha mmiri mgbe akpịrị kpọrọ ha nkụ. I sịkwara ha baa nʼime ala ahụ inweta ala ahụ bụ nke i weliri aka gị ṅụọ iyi inye ha.

Nehemiah 9:15 in English

Nehemiah 9:15 · Berean Standard Bible

In their hunger You gave them bread from heaven; in their thirst You brought them water from the rock. You told them to go in and possess the land which You had sworn to give them.

Context

13“I sitere nʼeluigwe gwa ha okwu, ị rịdatara nʼugwu Saịnaị, ị nyere ha iwu na ntụziaka niile ziri ezi, nyekwa ha ụkpụrụ na ihe niile dị mma nke enyere nʼiwu. 14I mere ka ha mata ụbọchị izuike gị dị nsọ, nyekwa ha iwu site nʼọnụ ohu gị Mosis, ka ha debe iwu gị na ụkpụrụ gị niile. 15I sitere nʼeluigwe nye ha achịcha mgbe agụụ gụrụ ha, sitekwa na nkume nye ha mmiri mgbe akpịrị kpọrọ ha nkụ. I sịkwara ha baa nʼime ala ahụ inweta ala ahụ bụ nke i weliri aka gị ṅụọ iyi inye ha. 16“Ma nna nna anyị ha erubeghị isi nʼokwu gị, nʼihi isiike ha na nganga ha. 17Ha egeghị ntị ọbụla, ha echetakwaghị ihe ịrịbama niile i meere ha. Kama ha nupuru isi họpụtara onwe ha onyeisi ga-eduru ha ịlaghachi Ijipt. Ma ị bụ Chineke onye na-eme ebere, onye na-agbaghara mmehie ndị gị mgbe ọbụla. Ị bụ onye obiọma, onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. I jupụtara nʼịhụnanya na amara mgbe niile. Nʼihi ya, ị gbakụtaghị ha azụ,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.