Nehemaya 7:71
Nehemiah 7:71 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụfọdụ ndịisi ezinaụlọ tinyere nʼụlọakụ maka ije ozi ahụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000),* na ọtụtụ minas ọlaọcha puku abụọ na narị abụọ (2,200).*
Nehemiah 7:71 in English
Nehemiah 7:71 · Berean Standard Bible
And some of the heads of the families gave to the treasury for the project 20,000 darics of gold * and 2,200 minas of silver.*
Context
69ịnyịnya kamel dị narị anọ na iri atọ na ise (435), ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa na iri abụọ (6,720). 70Ma ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye maka ọrụ ahụ. Onyeisi ọchịchị tinyere nʼụlọakụ otu puku darik ọlaedo (1,000),* iri efere ọlaedo ise (50) na uwe ndị nchụaja narị ise na iri atọ (530). 71Ụfọdụ ndịisi ezinaụlọ tinyere nʼụlọakụ maka ije ozi ahụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000),* na ọtụtụ minas ọlaọcha puku abụọ na narị abụọ (2,200).* 72Nkpọkọta ọnụọgụgụ nke ndị mmadụ fọdụrụ nyere bụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000), na minas ọlaọcha puku abụọ (2,000), na uwe ndị nchụaja iri isii na asaa (67). 73Ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị nche ọnụ ụzọ, ndị ọbụ abụ na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ na ndị Izrel niile fọdụrụ, gara birikwa nʼobodo nke ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.