Nehemaya 7:64
Nehemiah 7:64 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha nʼihi ya e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.
Nehemiah 7:64 in English
Nehemiah 7:64 · Berean Standard Bible
These men searched for their family records, but they could not find them and so were excluded from the priesthood as unclean.
Context
62Ndị agbụrụ:
Delaya, ndị Tobaya na ndị Nekoda, narị isii na iri anọ na abụọ (642). 63Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja:
Ndị agbụrụ:
Hobaya, Hakoz na Bazilai (nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead a kpọọ ya aha nʼaha ha). 64Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha nʼihi ya e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha. 65Nʼihi nke a, onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe aja dịkarịsịrị nsọ, tutu ruo mgbe a ga-enwe onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase. 66Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ na iri isii (42,360),
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.