Nehemaya 7:66
Nehemiah 7:66 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ na iri isii (42,360),
Nehemiah 7:66 in English
Nehemiah 7:66 · Berean Standard Bible
The whole assembly numbered 42,360,
Context
64Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha nʼihi ya e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha. 65Nʼihi nke a, onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe aja dịkarịsịrị nsọ, tutu ruo mgbe a ga-enwe onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase. 66Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ na iri isii (42,360), 67nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa, na narị atọ na iri atọ na asaa (7,337), ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ* dị narị abụọ, na iri anọ na ise (245). 68Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii (736), ịnyịnya muul narị abụọ na iri anọ na ise (245),
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.