Nehemaya 4:14
Nehemiah 4:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe m lezichara ihe niile anya, eguzooro m ọtọ sị ndị ahụ a na-asọpụrụ, na ndị ọchịchị niile na ndị ọzọ nʼobodo ahụ, “Unu atụla ha egwu. Chetanụ na Onyenwe anyị, nke dị ukwuu na-eyikwa egwu, ma bukwaaranụ ezinaụlọ unu, ụmụ unu ndị ikom ndị inyom, ndị nwunye unu na ụlọ unu agha.”
Nehemiah 4:14 in English
Nehemiah 4:14 · Berean Standard Bible
After I had made an inspection, I stood up and said to the nobles, the officials, and the rest of the people, “Do not be afraid of them. Remember the Lord, who is great and awesome, and fight for your brothers, your sons and your daughters, your wives and your homes.”
Context
12Ndị Juu ndị bi ha nso bịara ọtụtụ mgbe gwa anyị, “Ebe ọbụla unu gbagara, ha ga-ebuso unu agha.” 13Nʼihi ya, eguzobere m ndị ụfọdụ nʼebe niile dịkarịsịrị ala nʼazụ mgbidi ahụ, nʼebe niile ghere oghe, e guzobere ha, kpanye ha mma agha, ùbe na ụta nʼaka dịka ezinaụlọ ha si dị. 14Mgbe m lezichara ihe niile anya, eguzooro m ọtọ sị ndị ahụ a na-asọpụrụ, na ndị ọchịchị niile na ndị ọzọ nʼobodo ahụ, “Unu atụla ha egwu. Chetanụ na Onyenwe anyị, nke dị ukwuu na-eyikwa egwu, ma bukwaaranụ ezinaụlọ unu, ụmụ unu ndị ikom ndị inyom, ndị nwunye unu na ụlọ unu agha.” 15Mgbe ndị iro anyị chọpụtara na anyị amatala izu ọjọọ ha, na Chineke emebiekwala atụmatụ ha, anyị onwe anyị laghachiri nʼọrụ anyị nke iwuzi mgbidi ahụ. 16Sitekwa nʼoge ahụ gaa nʼihu, anyị kere onwe anyị ụzọ abụọ. Ụfọdụ ndị ji ùbe, ọta na ụta na-anọ na nche mgbe ndị ọzọ na-arụ ọrụ. Ndịisi niile pụtakwara guzo nʼazụ ndị Juda niile ebe ha nọ nʼihu ọrụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.