Native Bible

Nehemiah 4:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, eguzobere m ndị ụfọdụ nʼebe niile dịkarịsịrị ala nʼazụ mgbidi ahụ, nʼebe niile ghere oghe, e guzobere ha, kpanye ha mma agha, ùbe na ụta nʼaka dịka ezinaụlọ ha si dị.

Nehemiah 4:13 in English

Nehemiah 4:13 · Berean Standard Bible

So I stationed men behind the lowest sections of the wall, at the vulnerable areas. I stationed them by families with their swords, spears, and bows.

Context

11Ma nʼotu oge ahụ kwa, ndị iro anyị na-agba izu nʼakụkụ, na-achọ igbu anyị mgbe anyị na-eleghị anya ha maọbụ mara ka ọrụ ahụ kwụsị. 12Ndị Juu ndị bi ha nso bịara ọtụtụ mgbe gwa anyị, “Ebe ọbụla unu gbagara, ha ga-ebuso unu agha.” 13Nʼihi ya, eguzobere m ndị ụfọdụ nʼebe niile dịkarịsịrị ala nʼazụ mgbidi ahụ, nʼebe niile ghere oghe, e guzobere ha, kpanye ha mma agha, ùbe na ụta nʼaka dịka ezinaụlọ ha si dị. 14Mgbe m lezichara ihe niile anya, eguzooro m ọtọ sị ndị ahụ a na-asọpụrụ, na ndị ọchịchị niile na ndị ọzọ nʼobodo ahụ, “Unu atụla ha egwu. Chetanụ na Onyenwe anyị, nke dị ukwuu na-eyikwa egwu, ma bukwaaranụ ezinaụlọ unu, ụmụ unu ndị ikom ndị inyom, ndị nwunye unu na ụlọ unu agha.” 15Mgbe ndị iro anyị chọpụtara na anyị amatala izu ọjọọ ha, na Chineke emebiekwala atụmatụ ha, anyị onwe anyị laghachiri nʼọrụ anyị nke iwuzi mgbidi ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.