Nehemaya 4:15
Nehemiah 4:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ndị iro anyị chọpụtara na anyị amatala izu ọjọọ ha, na Chineke emebiekwala atụmatụ ha, anyị onwe anyị laghachiri nʼọrụ anyị nke iwuzi mgbidi ahụ.
Nehemiah 4:15 in English
Nehemiah 4:15 · Berean Standard Bible
When our enemies heard that we were aware of their scheme and that God had frustrated it, each of us returned to his own work on the wall.
Context
13Nʼihi ya, eguzobere m ndị ụfọdụ nʼebe niile dịkarịsịrị ala nʼazụ mgbidi ahụ, nʼebe niile ghere oghe, e guzobere ha, kpanye ha mma agha, ùbe na ụta nʼaka dịka ezinaụlọ ha si dị. 14Mgbe m lezichara ihe niile anya, eguzooro m ọtọ sị ndị ahụ a na-asọpụrụ, na ndị ọchịchị niile na ndị ọzọ nʼobodo ahụ, “Unu atụla ha egwu. Chetanụ na Onyenwe anyị, nke dị ukwuu na-eyikwa egwu, ma bukwaaranụ ezinaụlọ unu, ụmụ unu ndị ikom ndị inyom, ndị nwunye unu na ụlọ unu agha.” 15Mgbe ndị iro anyị chọpụtara na anyị amatala izu ọjọọ ha, na Chineke emebiekwala atụmatụ ha, anyị onwe anyị laghachiri nʼọrụ anyị nke iwuzi mgbidi ahụ. 16Sitekwa nʼoge ahụ gaa nʼihu, anyị kere onwe anyị ụzọ abụọ. Ụfọdụ ndị ji ùbe, ọta na ụta na-anọ na nche mgbe ndị ọzọ na-arụ ọrụ. Ndịisi niile pụtakwara guzo nʼazụ ndị Juda niile ebe ha nọ nʼihu ọrụ ha. 17Ndị na-edo nkume na ndị ọrụ ọbụla debere ngwa ọgụ ha nʼebe ọ ga-eru ha aka mgbe ọbụla ha na-arụ ọrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.