Nehemaya 4:12
Nehemiah 4:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Juu ndị bi ha nso bịara ọtụtụ mgbe gwa anyị, “Ebe ọbụla unu gbagara, ha ga-ebuso unu agha.”
Nehemiah 4:12 in English
Nehemiah 4:12 · Berean Standard Bible
At that time the Jews who lived nearby came and told us ten times over, “Wherever you turn, they will attack us.”
Context
10Mgbe ahụ, ndị Juda bidoro itamu ntamu na-asị, na ike ebidola ịgwụ ndị ọrụ ha, na mkpọmkpọ ihe fọdụrụ ka buru ibu, na naanị anyị apụghị ịrụcha mgbidi ahụ. 11Ma nʼotu oge ahụ kwa, ndị iro anyị na-agba izu nʼakụkụ, na-achọ igbu anyị mgbe anyị na-eleghị anya ha maọbụ mara ka ọrụ ahụ kwụsị. 12Ndị Juu ndị bi ha nso bịara ọtụtụ mgbe gwa anyị, “Ebe ọbụla unu gbagara, ha ga-ebuso unu agha.” 13Nʼihi ya, eguzobere m ndị ụfọdụ nʼebe niile dịkarịsịrị ala nʼazụ mgbidi ahụ, nʼebe niile ghere oghe, e guzobere ha, kpanye ha mma agha, ùbe na ụta nʼaka dịka ezinaụlọ ha si dị. 14Mgbe m lezichara ihe niile anya, eguzooro m ọtọ sị ndị ahụ a na-asọpụrụ, na ndị ọchịchị niile na ndị ọzọ nʼobodo ahụ, “Unu atụla ha egwu. Chetanụ na Onyenwe anyị, nke dị ukwuu na-eyikwa egwu, ma bukwaaranụ ezinaụlọ unu, ụmụ unu ndị ikom ndị inyom, ndị nwunye unu na ụlọ unu agha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.