Native Bible

Nehemiah 13:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, esitere m nʼebe m nọ chụpụ otu nʼime ụmụ ndị ikom Joiada, nwa Eliashib, onyeisi nchụaja, onye bụ ọgọ Sanbalat onye Hor.

Nehemiah 13:28 in English

Nehemiah 13:28 · Berean Standard Bible

Even one of the sons of Jehoiada son of Eliashib the high priest had become a son-in-law to Sanballat the Horonite. Therefore I drove him away from me.

Context

26Ọ bụghị ọlụlụ di na nwunye dị otu a wetara ọdịda Solomọn? O nweghị eze ọzọ dị na mba ọbụla a pụrụ iji tụnyere Solomọn, nʼihi na Chineke ya hụrụ ya nʼanya mee ya eze ndị Izrel niile. Ma ọ bụ ndị nwunye mba ọzọ ọ lụrụ dubara ya na mmehie ikpere arụsị. 27Ugbu a, ọ bụ ka anyị gere na ntị na unu onwe unu na-emekwa ajọ ihe dị otu a, na unu ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke anyị, site nʼịlụ ndị inyom ndị mba ọzọ?” 28Ya mere, esitere m nʼebe m nọ chụpụ otu nʼime ụmụ ndị ikom Joiada, nwa Eliashib, onyeisi nchụaja, onye bụ ọgọ Sanbalat onye Hor. 29Cheta ha, Chineke m, nʼihi na ha merụrụ ọrụ nchụaja, na ọgbụgba ndụ ọrụ nchụaja, na nke ndị Livayị. 30Ya mere, e doro m ndị nchụaja, na ndị Livayị ọcha, wezugakwa ihe ọbụla nke na-ekwesighị nʼebe ha nọ. E kenyere m ha ọrụ, onye ọbụla nʼije ozi ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.