Native Bible

Nehemiah 13:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a, ọ bụ ka anyị gere na ntị na unu onwe unu na-emekwa ajọ ihe dị otu a, na unu ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke anyị, site nʼịlụ ndị inyom ndị mba ọzọ?”

Nehemiah 13:27 in English

Nehemiah 13:27 · Berean Standard Bible

Must we now hear that you too are doing all this terrible evil and acting unfaithfully against our God by marrying foreign women?”

Context

25Ya mere, abaara m ha mba, bụkwaa ha ọnụ. Ụfọdụ ha ka m tiri ihe, dọọkwa ha nʼagịrị isi. Emesịa, emere m ka ha ṅụọ iyi nʼaha Chineke si: “Unu agaghị ekwekwa ka ụmụ ndị ikom na ndị inyom unu lụọ ndị mba ọzọ ma unu onwe unu agakwaghị alụtara ụmụ unu, maọbụ onwe unu, ndị inyom ndị mba ọzọ. 26Ọ bụghị ọlụlụ di na nwunye dị otu a wetara ọdịda Solomọn? O nweghị eze ọzọ dị na mba ọbụla a pụrụ iji tụnyere Solomọn, nʼihi na Chineke ya hụrụ ya nʼanya mee ya eze ndị Izrel niile. Ma ọ bụ ndị nwunye mba ọzọ ọ lụrụ dubara ya na mmehie ikpere arụsị. 27Ugbu a, ọ bụ ka anyị gere na ntị na unu onwe unu na-emekwa ajọ ihe dị otu a, na unu ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke anyị, site nʼịlụ ndị inyom ndị mba ọzọ?” 28Ya mere, esitere m nʼebe m nọ chụpụ otu nʼime ụmụ ndị ikom Joiada, nwa Eliashib, onyeisi nchụaja, onye bụ ọgọ Sanbalat onye Hor. 29Cheta ha, Chineke m, nʼihi na ha merụrụ ọrụ nchụaja, na ọgbụgba ndụ ọrụ nchụaja, na nke ndị Livayị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.