Nehemaya 13:30
Nehemiah 13:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, e doro m ndị nchụaja, na ndị Livayị ọcha, wezugakwa ihe ọbụla nke na-ekwesighị nʼebe ha nọ. E kenyere m ha ọrụ, onye ọbụla nʼije ozi ya.
Nehemiah 13:30 in English
Nehemiah 13:30 · Berean Standard Bible
Thus I purified the priests and Levites from everything foreign, and I assigned specific duties to each of the priests and Levites.
Context
28Ya mere, esitere m nʼebe m nọ chụpụ otu nʼime ụmụ ndị ikom Joiada, nwa Eliashib, onyeisi nchụaja, onye bụ ọgọ Sanbalat onye Hor. 29Cheta ha, Chineke m, nʼihi na ha merụrụ ọrụ nchụaja, na ọgbụgba ndụ ọrụ nchụaja, na nke ndị Livayị. 30Ya mere, e doro m ndị nchụaja, na ndị Livayị ọcha, wezugakwa ihe ọbụla nke na-ekwesighị nʼebe ha nọ. E kenyere m ha ọrụ, onye ọbụla nʼije ozi ya. 31Emekwara m ka a na-ebubata nkụ nke ebe ịchụ aja nʼoge kwesiri, meekwa ka a na-ewebata onyinye mkpụrụ mbụ niile nʼoge ha.
Cheta m Chineke, gosi m ihuọma gị.
13:6 Sairọs nyere onwe ya aha a, bụ Eze Babilọn, mgbe o meriri ndị Babilọn nʼagha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.