Native Bible

Nehemiah 12:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E dekọtara aha ndịisi ezinaụlọ ndị Livayị niile nʼụbọchị Eliashib, Joiada, Johanan na Jadua, nakwa nke ndị nchụaja nʼakwụkwọ nʼoge ọchịchị Daraiọs bụ eze Peshịa.

Nehemiah 12:22 in English

Nehemiah 12:22 · Berean Standard Bible

In the days of Eliashib, Joiada, Johanan,* and Jaddua, during the reign of Darius the Persian, the heads of the families of the Levites and priests were recorded.

Context

20Kalai, onyeisi ụmụ Salu; Eba, onyeisi ụmụ Amok, 21Hashabaya, onyeisi ụmụ Hilkaya; Netanel, onyeisi ndị Jedaya. 22E dekọtara aha ndịisi ezinaụlọ ndị Livayị niile nʼụbọchị Eliashib, Joiada, Johanan na Jadua, nakwa nke ndị nchụaja nʼakwụkwọ nʼoge ọchịchị Daraiọs bụ eze Peshịa. 23E dekwara aha ndịisi ndị Livayị niile nʼakwụkwọ tutu ruo nʼoge Johanan nwa Eliashib dị ndụ. 24Ndị a bụ ndịisi ndị Livayị nʼoge ahụ: Hashabaya, Sherebaya, Jeshua, nwa Kadmiel na ndị otu ha. Ha kere onwe ha ụzọ abụọ. Ụzọ abụọ ndị a na-eguzokwa na-eche ibe ha ihu mgbe ọbụla ha na-abụku Chineke abụ otuto na ekele. Otu ụzọ na-amalite nke ọzọ azaghachi, dịka Devid onye nke Chineke si nye ya nʼiwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.