Native Bible

Nehemiah 11:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị nche ọnụ ụzọ ama, Akub, Talmon na ndị otu ha dị otu narị na iri asaa na abụọ (172) nʼọnụọgụgụ, ha bụ ndị na-eche nche nʼọnụ ụzọ ama niile.

Nehemiah 11:19 in English

Nehemiah 11:19 · Berean Standard Bible

And the gatekeepers: Akkub, Talmon, and their associates, who kept watch at the gates—172 men.

Context

17Matanaya nwa Mika, nwa Zabdi, nwa Asaf, bụ onyendu nke duru nʼekpere na ofufe ekele. Bakbukaya onye nke abụọ nʼetiti ndị otu ya, na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun, bụ ndị na-enyere ya aka. 18Ọnụọgụgụ ndị Livayị niile nọ na obodo nsọ ahụ dị narị abụọ na iri asatọ na anọ (284). 19Ndị nche ọnụ ụzọ ama, Akub, Talmon na ndị otu ha dị otu narị na iri asaa na abụọ (172) nʼọnụọgụgụ, ha bụ ndị na-eche nche nʼọnụ ụzọ ama niile. 20Ndị fọdụrụ nʼIzrel, ha na ndị nchụaja, na ndị Livayị, nọ nʼobodo Juda niile, onye ọbụla nʼihe nketa ya. 21Ndị ahụ niile na-eje ozi nʼụlọnsọ bi nʼugwu Ofel. Ndịisi ha bụ Ziha na Gishpa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.