Nehemaya 10:31
Nehemiah 10:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Anyị kpebikwara na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ eburu ngwa ahịa ha maọbụ mkpụrụ ubi ha bịa ire ya nʼụbọchị izuike, maọbụ nʼụbọchị ọzọ dị nsọ, anyị agaghị azụ ihe ọbụla. Anyị na-ekpebikwa na anyị agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼafọ nke asaa niile, kwekọọkwa na anyị ga-agbaghara ụmụnna anyị niile ji anyị ụgwọ nʼafọ ahụ.
Nehemiah 10:31 in English
Nehemiah 10:31 · Berean Standard Bible
When the people of the land bring merchandise or any kind of grain to sell on the Sabbath day, we will not buy from them on a Sabbath or holy day. Every seventh year we will let the fields lie fallow, and will cancel every debt.
Context
29Ndị a niile sooro ụmụnne ha ndị Izrel a na-asọpụrụ, jikọtaa onwe ha nʼọbụbụ ọnụ na ịṅụ iyi ịgbaso iwu Chineke, nke o nyere site nʼaka Mosis, bụ ohu Chineke; na ilezi anya rube isi nʼihe niile enyere nʼiwu, ntụziaka niile na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị. 30“Anyị kpebikwara na ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom agaghị alụ di maọbụ nwunye site na mba ọzọ. 31“Anyị kpebikwara na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ eburu ngwa ahịa ha maọbụ mkpụrụ ubi ha bịa ire ya nʼụbọchị izuike, maọbụ nʼụbọchị ọzọ dị nsọ, anyị agaghị azụ ihe ọbụla. Anyị na-ekpebikwa na anyị agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼafọ nke asaa niile, kwekọọkwa na anyị ga-agbaghara ụmụnna anyị niile ji anyị ụgwọ nʼafọ ahụ. 32“Anyị kwekọrịtakwara na anyị ga-atụ ụtụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke otu shekel afọ niile maka iji kwadoo ọrụ ụlọnsọ ukwu Chineke, 33maka ime ka ihe ndị a dịrị nʼụlọnsọ ukwu ahụ: achịcha nsọ, onyinye ọka nke ụbọchị niile, aja nsure ọkụ na onyinye nke ụbọchị izuike, mmemme ọnwa ọhụrụ niile, ha na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka, maka aja dị nsọ niile na aja ikpuchi mmehie ndị Izrel, maka ozi niile a na-aga nʼụlọnsọ Chineke anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.